Zekaraia 5:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. M'we si, Gini ka ọ bu? Ọ si, Nka bu ihe-ọtùtù ephah nke nāpu apu. O we si, Nka bu oyiyi-ha n'ala nka nile:

7. (ma le, otù buruburu opù anēbuli ebuli:) nka bu kwa otù nwanyi nke nānọdu n'etiti ephah ahu.

8. O we si, Nka bu Nmebi-iwu; o we tubà ya n'etiti ephah ahu: o we tukwasi nkume opù ahu n'ọnu-ya.

9. M'we welie anyam abua, hu, ma le, ndinyom abua nāputa, ifufe di kwa na nkù-ha, n'ihi na ha nwere nkù abua dika nkù ub͕ala: ha we bulie ephah ahu n'etiti ala na elu-igwe.

10. M'we si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Òle ebe ka ndia nēbuga ephah ahu?

11. O we sim, Iwuru ya ulo n'ala Shaina: mb͕e edozisiri ya, agādọba ya n'ebe ahu n'ihe-ndọkwasi-ya.

Zekaraia 5