13. N'ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu.
14. N'ihi na edebezuwo iwu nile n'otù okwu, bú nka; Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
15. Ma ọ buru na unu atarita ibe-unu aru, ripia kwa ibe-unu, lezienu anya ka unu ghara ikpochapurita onwe-unu.
16. Ma asim, Nējegharinu site na Mọ Nsọ, unu agaghi-emezu kwa agu nke anu-aru maọli.
17. N'ihi na agu nāgu anu-aru megide Mọ Nsọ, agu nāgu kwa Mọ Nsọ megide anu-aru; n'ihi na ndia nēmegide onwe-ha; ka unu we ghara ime ihe ndia ọ bula unu nāchọ ime.