15. Hushai we si Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, Otú a na otú a ka Ahitofel duru Absalom na ndi-okenye Israel ọdu; otú a na otú a ka mu onwem du-kwa-ra.
16. Ma ub͕u a ziganu ngwa ngwa, gosi Devid, si, Anọla ọnọdu abali a n'ala ihe nādighi nke ọzara, kama i ghaghi igabiga; ka aghara iloda eze na ndi nile ndi ya na ha nọ.
17. Ma Jonatan na Ahimaaz nēguzo n'En-rogel; nwayi nēje ozi we je gosi ha; ndi ahu we je gosi eze, bú Devid: n'ihi na ọ gaghi-ekwe me, bú ka ahú ka ha ba n'obodo.
18. Otù nwa-okoro we hu ha, gosi, Absalom: ha abua we je ngwa ngwa, ba n'ulo otù nwoke nime Bahurim, onye nwere olùlù-miri n'ogige-ya; ha we rida n'ebe ahu.
19. Nwayi nwe-ulo we were ihe-nkpuchi-ya b͕asa ya n'ọnu olùlù-miri ahu, tusa ọka asuru asu n'elu ya; ma ọ dighi ihe amara.