1. Ndi Kọrint 14:16-22 Bible Nso (IGBOB)

16. Ma emeghi otú a, onye nọ n'ọnọdu onye nāmutaghi akwukwọ gēsi aṅa si Amen ahu mb͕e i nēkele ekele, ma ọ buru na i ji mọ-gi nāgọzi, ebe ọ nāmataghi ihe ọ bula i nēkwu?

17. N'ihi na ọ bu ezie na gi onwe-gi nēkele nke-ọma, ma ewulighi ibe-gi elu dika ulo.

18. Ekelem Chineke, na ejim asusu di iche iche nēkwu okwu kari unu nile:

19. otú ọ di, nime nzukọ Kraist anamachọ ka m'ji uchem kwu nkpuru okwu ise, ka m'were okwu-ọnum zí kwa ndi ọzọ ihe, kari ikwu orú nnù okwu na nnù ise n'asusu di iche.

20. Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n'uche-unu: kama burunu umu ọhu n'obi ọjọ, ma n'uche-unu burunu ndi tozuru okè.

21. Nime iwu Chineke ka edeworo ya, si, M'gēji madu ndi nāsu asusu di iche, ji kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi di iche, gwa ndi nka okwu; ma ọbuná otú a ha agaghi-anu olum, ka Onye-nwe-ayi kwuru.

22. Ya mere asusu di iche iche ndia, emere ka ha buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi kwere ekwe, kama nye ndi nēkweghi ekwe: ma emere ibu-amuma ka ọ buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi nēkweghi ekwe, kama nye ndi kwere ekwe.

1. Ndi Kọrint 14