Zekaraia 9:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. M'gāma-kwa-ra ulom ulo-ikwū, dika ebe-nguzo-ndi-agha, n'ihi onye-ngabiga na n'ihi onye nālata: ka onye nāchi n'ihe-ike we ghara igabiga kwa n'akuku ha ọzọ: n'ihi na ub͕u a ka M'jiworo anyam abua hu.

9. Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.

10. M'gēbipu kwa ub͕ọ-ala n'Efraim, bipu kwa inyinya na Jerusalem, agēbipu kwa uta agha; Ọ gāgwa kwa mba nile okwu udo:Ọ gāchi kwa achi site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.

11. Gi onwe-gi kwa, n'ihi ọbara ọb͕ub͕a-ndu-gi ka M'zipuworo ndi-nkpọrọ-gi n'olùlù nke miri nādighi nime ya.

12. Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi.

13. N'ihi na azọworom Onwem Juda ukwu ikwe ya dika uta, uta ahu ka M'mejuworo n'Efraim dika àkú; M'gākpọte kwa umu-gi, Zaion, imegide umu-gi, Jevan, M'gēme kwa gi ka i di ka mma-agha dike.

Zekaraia 9