Zekaraia 8:14-18 Bible Nso (IGBOB)

14. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Dika M'zubere ime unu ihe ọjọ, mb͕e nna-unu-hà kpasurum iwe, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ma echègharighm uche:

15. otú a ka M'zubewo-kwa-ra ọzọ n'ubọchi ndia ime Jerusalem, ime kwa ulo Juda, nma: unu atula egwu.

16. Ndia bu ihe unu gēme; Kwuenu, onye ọ bula ọ gwa ibe-ya, ezi-okwu; Kpenu ikpe ezi-okwu na ikpe udo n'ọnu-uzọ-ama nile unu:

17. unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide ibe-ya; unu ahu-kwa-la ọb͕ub͕a-iyi ugha n'anya: n'ihi na ihe ndia nile bu ihe nke M'kpọworo asì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

18. Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si,

Zekaraia 8