Zekaraia 6:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, ub͕ọ-ala anọ nēsi n'etiti ugwu abua puta; ugwu ahu bu ugwu ọla.

2. N'ub͕ọ-ala mbu ka inyinya nācha uhie uhie di; n'ub͕ọ-ala nke-abua ka inyinya nēji nji di;

3. n'ub͕ọ-ala nke-atọ ka inyinya nācha ọcha di; n'ub͕ọ-ala nke-anọ ka inyinya turu agwa nwe-kwa-ra ume di.

4. M'we za, si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Gini bu ndia, onye-nwem?

5. Mọ-ozi ahu we za, sim, Ndia bu ifufe anọ nke elu-igwe, ndi nēsi n'iguzo onwe-ha n'iru Onye-nwe uwa nka nile pua.

Zekaraia 6