Zekaraia 3:8-10 Bible Nso (IGBOB)

8. Biko, nuru, gi Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, gi onwe-gi na ndi-ibe-gi ndi nānọdu ala n'iru gi; n'ihi na ndi bu ihe-ebube ka ha bu: n'ihi na, le, M'gaje ime ka orùm, bú Ihe-opupú ahu, puta ìhè.

9. N'ihi na, le, nkume ahu nke M'tiyeworo n'iru Joshua; n'elu otù nkume ka anya asa di: le, M'gēb͕u eb͕ub͕u-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēbupu kwa ajọ omume ala ahu n'otù ubọchi.

10. N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka unu gākpọbata, onye ọ bula ọ kpọbata madu-ibe-ya, n'okpuru osisi vine na n'okpuru osisi fig.

Zekaraia 3