1. Ọ we me ka m'hu Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, ka ọ nēguzo n'iru mọ-ozi nke Jehova, na Setan, ka o nēguzo n'aka-nri-ya imegide ya.
2. Jehova we si Setan, Jehova basiere gi nba ike, Setan; e, Jehova Nke rọputaworo Jerusalem basiere gi nba ike: onye a, ọ̀ bughi ọlọkọ-ọku alọputara n'ọku?
3. Ma Joshua nēyi uwe rusiri inyi, guzo n'iru mọ-ozi ahu.
4. O we za, gwa ndi nēguzo n'iru ya okwu, si, Chizuga uwe rusiri inyi n'aru ya. O we si ya, Le, emewom ka ajọ omume-gi si n'aru gi gabiga, M'gēyibe kwa gi uwe ememe.
5. M'we si, Ka ha kukùa ákwà-nkukù-isi nwuru enwu n'isi-ya. Ha we kee akwa nkechi-isi nwuru enwu n'isi-ya, yibe ya uwe; mọ-ozi Jehova nēguzo kwa n'ebe ahu.
6. Mọ-ozi nke Jehova we b͕ara Joshua àmà nke-uku, si,
7. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ buru na i je ije n'uzọm nile, ọ buru kwa na i debe ihe-ndebem, ọ gābu kwa na gi onwe-gi gēkpe ulom ikpe, ọzọ, i gēdebe kwa ogigem nile, M'gēnye kwa gi ebe-njeghari di iche iche n'etiti ndia nēguzo n'ebe a.