2. Kwasie ákwá ike, gi osisi fir, n'ihi na osisi cedar adawo, n'ihi na emebiwo osisi nke mab͕uru onwe-ha: kwasienu ákwá ike, unu osisi oak nke Beshan, n'ihi na oké ọhia alùgh-alù adawo.
3. Ge nti, ọ bu olu nke ikwasi-ákwá-ike nke ndi-ọzùzù-aturu! n'ihi na emebiwo ebube-ha: ge nti, ọ bu olu ib͕ọ-uja nke umu-ọdum! n'ihi na emebiwo nbili-elu nke Jọdan.
4. Otú a ka Jehova, bú Chinekem, siri: Nāzù ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u;
5. nke ndi nāzù ha nēb͕u ha, ma ikpe adighi-ama ha; ọzọ, ndi nēre ha nāsi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, n'ihi na abum ọgaranya: ndi-ọzùzù-ha adighi-enwe ọmiko n'aru ha.
6. N'ihi na M'gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n'aru ndi bi n'ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n'aka ibe-ya na n'aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M'gaghi-anaputa kwa ha n'aka-ha.