Zekaraia 1:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. Kpọsa ọzọ, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obodom nile gēsite n'ezi ihe b͕asa ọzọ; Jehova gākasi kwa Zaion obi ọzọ, rọputa Jerusalem ọzọ.

18. M'we welie anyam abua, hu, ma le, mpi anọ.

19. M'we si mọ-ozi nke nāgwam okwu, Ìhe ndia bu gini? Ọ we zam, Ndia bu mpi ahu nke sọsaworo Juda na Israel na Jerusalem.

20. Jehova we me ka m'hu ndi-ọ̀kà anọ.

21. M'we si, Gini ka ndia nābia ime? O kwue, si, Ndia bu mpi ndi sọsara Juda, onye ọ bula we ghara iweli isi-ya: ma ndia abiawo ime ka ha ma jijiji, ituda mpi nile nke mba nile, ndi buliri mpi-ha imegide ala Juda isọsa ya.

Zekaraia 1