Zefanaia 2:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Chikọtanu onwe-unu, e, chikọta dika ahihia-ọka, unu mba nke nēnweghi ihere;

2. tutu ukpuru amuputa nwa, (ubọchi agabigawo dika ib͕ob͕o-ọka), mb͕e ọnuma nke iwe Jehova akābiakwasighi unu, mb͕e ubọchi iwe Jehova akābiakwasighi unu.

3. Chọnu Jehova, unu nile ndi di ume-ala n'obi bi n'uwa, ndi luworo ihe O kpere n'ikpe; chọnu ezi omume, chọnu ume-ala-n'obi: eleghi anya agēzobe unu n'ubọchi iwe Jehova.

4. N'ihi na Geza gābu ebe arapuru arapu, Ashkelon gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu: Ashdod, n'etiti-ehihie ka agāchupu ya, agēropu kwa Ekron.

5. Ahuhu diri ndi bi n'akuku oké osimiri, bú mba ndi Keret! Okwu Jehova nēmegide unu, Kenean, ala ndi Filistia; M'gēme kwa ka i la n'iyì ghara inwe onye-obibi.

6. Akuku oké osimiri gābu kwa ebe-obibi ebe-obibi, bú ulo ntà nke ndi-ọzùzù-aturu na ogige ìgwè ewu na aturu.

Zefanaia 2