Taitọs 1:10-16 Bible Nso (IGBOB)

10. N'ihi na ọtutu madu di ndi nēkweghi idi n'okpuru iwu, ndi nēkwu okwu efu, ndi nāghọb͕u kwa obi madu, ma nke kachasinu ndi si n'etiti ndi obibì-úgwù puta,

11. ndi anāghaghi imechi ọnu-ha; ha bu madu ndi nēkpù madu dum di n'èzí-na-ulo iru, nēzí ihe nke nēkwesighi ka ha zí, n'ihi urù nēweta ihere.

12. Otù onye n'etiti ha, bú onye-amuma nke aka ha, siri, Ndi Krit bu ndi-ugha mb͕e dum, anu-ọhia jọrọ njọ, ndi afọ-nri nādighi-alu ọlu.

13. Àmà nka bu ezi-okwu. N'ihi ihe a were kwa aka ike tu ha nmehie-ha n'anya, ka ha we nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi,

14. ka ha ghara iṅa nti akukọ-irò ihe di iche nke ndi-Ju, na ihe di iche iche nke madu nyere n'iwu, bú ndi nēchighari rapu ezi-okwu ahu.

15. Ihe nile di ọcha n'ebe ndi di ọcha nọ: ma n'ebe ndi emeruworo ndi nēkweghi kwa ekwe nọ ọ dighi ihe ọ bula di ọcha; kama, emeruwo ma uche-ha ma akọ-na-uche-ha.

16. Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.

Taitọs 1