Ọpupu 8:23-29 Bible Nso (IGBOB)

23. M'gētiye kwa nb͕aputa n'etiti ndim na ndi-gi: echi ka ihe-iriba-ama nka gādi.

24. Jehova we me otú a; odudu nke bara uba nke-uku we ba n'ulo Fero na ulo ndi-orù-ya: ọ bu kwa n'ala Ijipt nile ka ebibiri ala ahu n'ihi odudu.

25. Fero we kpọ Moses na Eron, si, Jenu, chuara Chineke-unu àjà n'ala nka.

26. Moses we si, O kwesighi ime otú a; n'ihi na ihe-árú ndi Ijipt ka ayi gēji chuara Jehova, bú Chineke-ayi, aja: le, àyi gēwere ihe-árú ndi Ijipt chu àjà n'anya-ha, ha agaghi-atub͕u kwa ayi na nkume?

27. Ije nke ubọchi atọ ka ayi gēje n'ọzara, chu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-ayi, àjà, dika Ọ nāsi ayi me.

28. Fero we si, Mu onwem gēzipu unu, ka unu we chuara Jehova, bú Chineke-unu, àjà n'ọzara; ọ bu nání na unu agaghi-eje ebe di anya nke-uku: riọrọnum aririọ.

29. Moses we si, Le, Mu onwem nēsi n'ebe i nọ pua, m'gāriọ kwa Jehova ka odudu we wezuga onwe-ha n'ebe Fero nọ, na n'ebe ndi-orù-ya nọ, na n'ebe ndi-ya nọ, echi: ma ka Fero ghara ikwa emò ọzọ, n'ighara izipu ndi Israel ichuru Jehova àjà.

Ọpupu 8