Ọpupu 40:7-12 Bible Nso (IGBOB)

7. I gētiye kwa ite ọsisa-miri ahu n'etiti ulo-ikwū nzute ahu na ebe-ichu-àjà ahu, tiye miri n'ebe ahu.

8. I gēdebe kwa ogige ahu buruburu, tiye ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu.

9. I gēwere kwa manu otite-manu ahu te ebe-obibi ahu, na ihe nile nke di nime ya, i gēdo kwa ya nsọ, na ihe-ya nile: ọ gādi kwa nsọ.

10. I gēte kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu manu, ya na ihe-ya nile, do ebe-ichu-àjà ahu nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.

11. I gēte kwa ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya manu, do ya nsọ.

12. I gēme kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha biarue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu nso, i gēwere kwa miri sa ha aru.

Ọpupu 40