Ọpupu 32:20-25 Bible Nso (IGBOB)

20. O we were nwa-ehi ahu nke ha mere, sure ya n'ọku, gwe ya rue mb͕e o mere irighiri, o we fesa ya n'elu miri, me ka umu Israel ṅua ya.

21. Moses we si Eron, Gini ka ndi nka mere gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasi ha?

22. Eron we si, Ka iwe onye-nwem ghara idi ọku: gi onwe-gi amawo ndi nka, na ọ bu nime ihe ọjọ ka ha nọ.

23. Ha we sim, Mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.

24. M'we si ha, Onye ọ bula nke nwere ọla-edo, ka ha tijipu ya n'aru ha; ha we nyem: m'we tubà ya n'ọku, nwa-ehi a we puta.

25. Moses we hu ndi ahu na ndi nādighi nchikọta ka ha bu; n'ihi na Eron emewo ka ha ghara idi nchikọta, ka ha buru ihe-ntakwu n'etiti ndi nēbili imegide ha:

Ọpupu 32