Ọpupu 3:2-7 Bible Nso (IGBOB)

2. Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya n'ire ọku site n'etiti osisi ntà: o we hu, ma, le, osisi ntà ahu nēre ọku, ma erepiaghi osisi ntà ahu.

3. Moses we si, Ka m'wezuga onwem, hu oké ihe-ọhuhu nka; gini mere osisi ntà ahu nējighi rechapu?

4. Jehova we hu na o wezugara onwe-ya ihu, Chineke we si n'etiti osisi ntà ahu kpọ ya òkù, si, Moses, Moses. Ọ si, Lekwam.

5. Ọ si, Abiarula nso ebe a: yipu akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi abua, n'ihi na ebe nke gi onwe-gi nēguzo n'elu ya, ala nsọ ka ọ bu.

6. Ọ si kwa, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Moses we zobe iru-ya; n'ihi na ọ nātu egwu ilegide Chineke anya.

7. Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;

Ọpupu 3