11. Ma Ọ setipughi aka-Ya megide ndi ahu arọputara n'etiti umu Israel: ha we hu Chineke anya, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.
12. Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n'ebe ahu: ka M'nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M'nyere n'iwu, bú nke M'deworo, ka i we zí ha.
13. Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke.
14. Ma ndi-okenye Israel ka ọ siri, Nọdunu n'ebe a nēche ayi, rue mb͕e ayi gālaghachikute unu: ma, le, Eron na Hua nọ n'etiti unu: onye nwere okwu, ya biakute ha nso.