Ọpupu 16:16-25 Bible Nso (IGBOB)

16. Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, Chikọtanu ufọdu nime ya, onye ọ bula dika oriri-ya si di; otù ọtùtù omer otù isi, dika ọnu-ọgugu madu-unu si di, ka unu gēwere ya, onye ọ bula o were ndi nọ n'ulo-ikwū-ya.

17. Umu Israel we me otú a, chikọta, otù onye nāchikọta ri nne, nke-ọzọ nāchikọta nke ntà.

18. Ha we were omer tùa ya, onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya, onye chikọta-kwa-ra nke ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka ha chikọtara.

19. Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu.

20. Ma ha egeghi Moses nti; madu ufọdu nime ha we me ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu, o we b͕a ikpuru, nēsì ísì: Moses we we iwe n'aru ha.

21. Ha we nāchikọta ya kwa-ututu, onye ọ bula dika oriri-ya si di: ma mb͕e anyanwu di ọku ọ b͕aze.

22. O rue, n'ubọchi nke-isi, na ha chikọtara nri okpukpu abua, ha nwere omer abua n'otù n'otù: ndi-isi nile nke nzukọ we bia, gosi Moses.

23. Ọ si ha, Nke ahu bu ihe Jehova kwuworo, si, Idebe-ubọchi-izu-ike, bú ubọchi-izu-ike di nsọ nye Jehova, ka echi bu: ihe unu nēghe, ghenu ya, ihe unu nēsi kwa, sienu ya; ma ihe nile nke fọduru, dọbaranu onwe-unu ya, ka ọ buru ihe-ndebe rue ututu.

24. Ha we dọba ya rue ututu, dika Moses nyere iwu: ma o sìghi ísì, ikpuru adighi kwa nime ya.

25. Moses we si, Rienu ya ta; n'ihi na ubọchi-izu-ike diri Jehova ka ta bu: ta unu agaghi-achọta ya n'ọhia.

Ọpupu 16