Ọnu-Ọgugu 7:60-64 Bible Nso (IGBOB)

60. N'ubọchi nke-iteghete onye-isi umu Benjamin nwere, bú Abidan nwa Gideoni, wetara ihe-ya nso:

61. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

62. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;

63. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure ọku;

64. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

Ọnu-Ọgugu 7