7. Ọ gaghi-emeru onwe-ya bayere nna-ya, ma-ọbu bayere nne-ya, ma-ọbu bayere nwa-nne-ya nwoke, maọbu bayere nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ha nwuru; n'ihi na nkewaputa Chineke-ya di n'isi-ya.
8. Ubọchi nile nke nkewaputa-ya nsọ ka ọ diri Jehova.
9. Ma mb͕e onye nwuru anwu gānwu n'akuku-ya na ntabi-anya, na mberede, o we merua isi nkewaputa-ya; ọ gākọpu kwa isi-ya n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha, n'ubọchi nke-asa ka ọ gakọpu ya.
10. N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwetara onye-nchu-àjà nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
11. Onye-nchu-àjà gēme otù ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, o gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, n'ihi nmehie nke ọ mehiere site na madu ahu nwuru anwu, o gēdo kwa isi-ya nsọ n'ubọchi ahu.