12. ókè-ala ahu gāridaru kwa Jọdan, ọpupu-ya nile gādiru kwa Oké Osimiri Nnu: nka gāburu unu ala, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu.
13. Moses we nye umu Israel iwu, si, Nka bu ala ahu nke unu gēketa n'ife-nzà, nke Jehova nyere iwu bayere ya inye ebo iteghete ahu na nkera ebo ahu:
14. n'ihi na ebo umu ndi Reuben dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ebo umu ndi Gad dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, anarawo, nkera ebo Manase anarawo kwa, ihe-nketa-ha;
15. ebo abua ahu na nkera ebo ahu anarawo ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan nka na nso Jeriko n'akuku Iru-anyanwu, n'uzọ ọwuwa-anyanwu.
16. Jehova we gwa Moses okwu, si,