23. Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu.
24. Unu wuere onwe-unu obodo ufọdu ebe umu-ntakiri-unu gēbi, wu-kwa-ra ìgwé ewu na aturu-unu ogige; me-kwa-nu ihe nēsi n'ọnu-unu puta.
25. Umu Gad na umu Reuben we gwa Moses okwu, si, Ndi-orù-gi gēme dika onye-nwem nēnye iwu.
26. Umu-ntakiri-ayi, na ndinyom-ayi, na anumanu-ayi, na anu-ulo-ayi nile, gānọ n'ebe ahu n'obodo nile nke Gilead:
27. ma ndi-orù-gi gāgabiga, onye ọ bula nke ejikere iso usu-ndi-agha, n'iru Jehova ibu agha, dika onye-nwem nēkwu.
28. Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi nke ndi bu nna ebo nile nke umu Israel, iwu bayere ha.