Ọnu-Ọgugu 3:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. n'ihi na Mu nwe nwa ọ bula eburu uzọ mu; n'ubọchi M'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro umu nile eburu uzọ mu n'Israel nsọ nye onwem, ma madu ma anumanu: nkem ka ha bu; Mu onwem bu Jehova.

14. Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, si,

15. Gukọta umu Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru ka i gāgukọta ha.

16. Moses we gukọta ha n'okwu-ọnu Jehova, dika enyere ya iwu.

17. Ndia bu kwa umu-ndikom Livai n'aha-ha; Giashon, na Kohat, na Merari.

18. Ndia bu kwa aha umu-ndikom Giashon dika ab͕uru nile ha si di; Libni na Shimai.

Ọnu-Ọgugu 3