1. Ma ndia bu osuso-ọmumu nile nke Eron na Moses n'ubọchi Jehova gwara Moses okwu n'ugwu Sainai.
2. Ndia bu kwa aha umu-ndikom Eron;ọkpara-ya, bú Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.
3. Ndia bu aha nke umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà ndi etere manu, ndi ọ mejuru aka ibu ndi-nchu-àjà.