Ọnu-Ọgugu 17:5-9 Bible Nso (IGBOB)

5. O gēru kwa, na nwoke ahu nke M'gārọputa, nkpa-n'aka-ya gāma ifuru: M'gēme kwa ka ntamu nile nke umu Israel si n'arum bìe, bú nke ha onwe-ha nātamu megide unu.

6. Moses we gwa umu Israel okwu, ndi-isi-ha nile we nye ya nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di nkpa-n'aka iri na abua: nkpa-n'aka Eron di kwa n.etiti nkpa-n'aka-ha.

7. Moses we do nkpa-n'aka nile n'iru Jehova n'ulo-ikwū nke ihe-àmà.

8. O rue n'echi-ya, na Moses bara n'ulo-ikwū nke ihe-àmà; ma, le, nkpa-n'aka Eron nke diri ulo Livai amawo ifuru, b͕awa kwa ifuru ahu, wa kwa okoko, mì kwa almond chara acha.

9. Moses we si n'iru Jehova chiputara umu Israel nile nkpa-n'aka ahu nile: ha we le anya, were ha, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya.

Ọnu-Ọgugu 17