Ọnu-Ọgugu 17:4-8 Bible Nso (IGBOB)

4. I gēdo kwa ha n'ulo-ikwū n'iru ihe-àmà ahu, ebe Mu na unu nēzute.

5. O gēru kwa, na nwoke ahu nke M'gārọputa, nkpa-n'aka-ya gāma ifuru: M'gēme kwa ka ntamu nile nke umu Israel si n'arum bìe, bú nke ha onwe-ha nātamu megide unu.

6. Moses we gwa umu Israel okwu, ndi-isi-ha nile we nye ya nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, otù onye-isi otù nkpa-n'aka, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di nkpa-n'aka iri na abua: nkpa-n'aka Eron di kwa n.etiti nkpa-n'aka-ha.

7. Moses we do nkpa-n'aka nile n'iru Jehova n'ulo-ikwū nke ihe-àmà.

8. O rue n'echi-ya, na Moses bara n'ulo-ikwū nke ihe-àmà; ma, le, nkpa-n'aka Eron nke diri ulo Livai amawo ifuru, b͕awa kwa ifuru ahu, wa kwa okoko, mì kwa almond chara acha.

Ọnu-Ọgugu 17