20. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
21. Kewapunu onwe-unu n'etiti nzukọ nka, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya.
22. Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?