23. bú ihe nile nke Jehova nyere unu n'iwu n'aka Moses, site n'ubọchi nke Jehova nyere iwu, we gaba n'iru rue ọb͕ọ nile unu;
24. ọ gēru kwa, ma ọ buru na emewo ya n'amaghi-ama, n'ebe anya nzukọ Israel nērughi, na nzukọ ahu nile gēme otù nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova, ya na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-Ihe-ọṅuṅu-ya, dika ikpé-ya si di, na otù nkpi iji chu àjà-nmehie.
25. Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nzukọ nile nke umu Israel nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha; n'ihi na amaghi-ama ka ọ bu, ha onwe-ha ewetawo kwa nso onyinye-ha iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova, na àjà-nmehie-ha n'iru, Jehova, n'ihi amaghi-ama-ha:
26. agāb͕aghara kwa nzukọ nile nke umu Israel, ha na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha; n'ihi na n'ebe ndi Israel nile nọ emere ya n'amaghi-ama.
27. Ma ọ buru na otù onye emehie n'amaghi-ama, ọ gēweta kwa nso nne-ewu nke b͕ara otù arọ iji chu àjà-nmehie.