18. we hu ala ahu, ihe ọ bu; na ndi ahu ndi bi na ya, ma ọ bu ndi di ike ka ha bu, ma-ọbu ndi nādighi ike, ma ọ bu madu ole-na-ole ka ha di, ma-ọbu ọtutu madu;
19. na ihe ala ahu bu nke ndi ahu nēbi nime ya, ma ọ bu ezi ala ka ọ bu ma-ọbu ala ọjọ; na ihe obodo nile bu nke ndi ahu nēbi nime ha, ma ọ bu na ha bi n'ọmuma-ulo-ikwū, ma-ọbu n'ebe ewusiri ike;
20. na ihe ala ahu bu, ma ọ bu ala nwere ume ka ọ bu ma-ọbu ala nātà ihe, ma osisi di nime ya, ma-ọbu na ọ dighi. Me kwa onwe-unu ka unu di ike, weta kwa ufọdu nime nkpuru ala ahu. Ma mb͕e ahu bu mb͕e nke nkpuru mbu nke nkpuru-vine.
21. Ha we rigo, ledo ala ahu site n'ọzara Zin rue Rehob, na nbata Hemat.