Ọnu-Ọgugu 13:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Moses we ziga ha iledo ala Kenean, ọ si ha, Rigonu n'uzọ a nime Negeb, rigo-kwa-nu n'ugwu:

18. we hu ala ahu, ihe ọ bu; na ndi ahu ndi bi na ya, ma ọ bu ndi di ike ka ha bu, ma-ọbu ndi nādighi ike, ma ọ bu madu ole-na-ole ka ha di, ma-ọbu ọtutu madu;

19. na ihe ala ahu bu nke ndi ahu nēbi nime ya, ma ọ bu ezi ala ka ọ bu ma-ọbu ala ọjọ; na ihe obodo nile bu nke ndi ahu nēbi nime ha, ma ọ bu na ha bi n'ọmuma-ulo-ikwū, ma-ọbu n'ebe ewusiri ike;

20. na ihe ala ahu bu, ma ọ bu ala nwere ume ka ọ bu ma-ọbu ala nātà ihe, ma osisi di nime ya, ma-ọbu na ọ dighi. Me kwa onwe-unu ka unu di ike, weta kwa ufọdu nime nkpuru ala ahu. Ma mb͕e ahu bu mb͕e nke nkpuru mbu nke nkpuru-vine.

21. Ha we rigo, ledo ala ahu site n'ọzara Zin rue Rehob, na nbata Hemat.

22. Ha we rigo nime Negeb, biarue Hebron; ma n'ebe ahu ka Ahiman na Sheshai na Talmai, bú umu Anak, nọ (Ma ewuru Hebron arọ asa tutu ewue Zoan n'Ijipt.)

Ọnu-Ọgugu 13