2. Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha nile, nwoke ọ bula, onye na isi-ya onye na isi-ya;
3. site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel, unu gāgukọta ha, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, gi onwe-gi na Eron.
4. Madu ganọye-kwa-ra unu, otù nwoke gādiri otù ebo; nwoke ọ bula, onye-isi ulo nna-ya-hà ka ọ bu.
5. Ndia bu kwa aha ndikom unu na ha gēguzo: nke Reuben; Elizua nwa Shedeua.