Ọlu Ndi-Ozi 8:14-23 Bible Nso (IGBOB)

14. Ma mb͕e ndi-ozi ndi nọ na Jerusalem nuru na Sameria anarawori okwu Chineke nke-ọma, ha zigara ha Pita na Jọn:

15. ndi, mb͕e ha ridatara, ha kpere ekpere bayere ha, ka ha we nara Mọ Nsọ:

16. n'ihi na ọ kādakwasighi n'isi onye ọ bula n'etiti ha: ọ bu nání na emere ha-ri baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus.

17. Mb͕e ahu ha bikwasiri ha aka-ha n'isi, ha we nara Mọ Nsọ.

18. Ma mb͕e Saimon huru na anēnye Mọ Nsọ site n'ibikwasi aka nke ndi-ozi, o chere ego n'iru ha,

19. si, Nye-kwa-num ike a, ka, onye ọ bula m'gēbikwasi akam abua n'isi, ka o we nara Mọ Nsọ.

20. Ma Pita siri ya, Ka ọla-ọcha-gi so gi la n'iyì, n'ihi na i chère na i gānata onyinye Chineke site n'ego.

21. I nweghi òkè ma-ọbu ihe-nketa n'okwu a: n'ihi na obi-gi ezighi ezi n'iru Chineke.

22. Ya mere chègharia n'obi ọjọ gi a, riọ Onye-nwe-ayi, ma eleghi anya agāb͕aghara gi èchìchè obi-gi.

23. N'ihi na ahurum na i nọ n'òlùlù ilu na ab͕u nke ajọ omume.

Ọlu Ndi-Ozi 8