31. Mb͕e ha nāchọ uzọ ib͕u ya, akukọ we rigo rue nti onye-isi-ọchi-agha nke òtù ndi-agha, na Jerusalem dum nāb͕a aghara.
32. Ngwa ngwa o we chiri ndi-agha na ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, we b͕adakwasi ha: mb͕e ha huru onye-isi-ọchi-agha na ndi-agha, ha we rapu iti Pọl ihe.
33. Mb͕e ahu onye-isi-ọchi-agha biaruru nso, jide ya, si ka ewere nkpọrọ abua ke ya; ọ ju-kwa-ra onye ọ bu, na ihe o mereri.
34. Ufọdu nime ìgwè madu ahu we ti nkpu otù ihe, ndi ọzọ ti kwa ihe ọzọ: ma mb͕e ọ nāpughi imata okwu di itukwasi obi n'ihi ùzù ahu, ọ si ka ekuru ya ba n'ulo ndi-agha.