Ọlu Ndi-Ozi 14:22-26 Bible Nso (IGBOB)

22. nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.

23. Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n'otù n'otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n'aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya.

24. Ha we gabiga n'etiti Pisidia, bia rue Pamfilia.

25. Mb͕e ha kwusiri okwu Chineke na Paga, ha ridata n'Atalaia;

26. ha we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n'amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru.

Ọlu Ndi-Ozi 14