17. Ma mb͕e Pita nēnwe obi abua nime onwe-ya ihe ọ gābu, bú ọhù ọ hururi, le, ndikom ahu ndi Kọniliọs zitereri, ebe ha jusiri ajuju ulo Saimon, ha guzoro n'ọnu-uzọ-ama,
18. we kpọ jua ma Saimon, onye anākpọ kwa Pita, nānọ dika ọbìa n'ebe ahu.
19. Ma mb͕e ọhù ahu nādi n'obi Pita, Mọ Nsọ siri ya, Le, ndikom atọ nāchọ gi.
20. Ma bilie, rida, so ha ga, enweghi uche abua: n'ihi na Mu onwem ezitewo ha.