9. Mb͕e ọ bula ihe anọ ahu nke di ndu gēnye Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu otuto na nsọpuru na ekele, bú Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi,
10. orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n'ala n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n'iru oche-eze ahu, nāsi,
11. Gi, Onye-nwe-ayi na Chineke-ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n'ihi na Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n'ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè.