Nkpughe 4:2-5 Bible Nso (IGBOB)

2. Ngwa ngwa emerem ka m'nọ nime Mọ Nsọ: ma le, edebere oche-eze n'elu-igwe, otù Onye nānọkwasi kwa n'oche-eze ahu;

3. Onye ahu Nke nānọdu ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ buru na anēle Ya anya: eke-na-ogwurugwu di kwa oche-eze ahu gburugburu, yiri emerald ma ọ buru na anēle ya anya.

4. Orú oche-eze na anọ di kwa oche-eze ahu gburugburu: m'we hu orú ndi-okenye na anọ ka ha nānọkwasi n'oche-eze ndia, ndi eb͕okwasiworo uwe ọcha; ahu-kwa-ram okpu-eze nke ọla-edo n'isi-ha.

5. Àmùmà na olu na éb͕è-elu-igwe nēsi kwa n'oche-eze ahu puta. Ọwa nke ọku asa nēnwu n'iru oche-eze ahu, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke;

Nkpughe 4