Nkpughe 2:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. Amataram nkpab͕u-gi, na ob͕eye i bu (ma i bu ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndi nāsi na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha bu ulo-nzukọ Setan.

10. Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n'etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M'gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.

11. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, agaghi-emejọ ya site n'ọnwu nke-abua ahu.

12. Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Pagamọm akwukwọ, si,Ihe ndi ka O nēkwu, bú Onye ahu Nke nwere mma-agha di nkọ ahu nke nwere iru abua:

13. Amataram ebe i bi, bú ebe oche-eze Setan di: i nējidesi kwa aham ike, i gọnarighi kwa okwukwem, ọbuná n'ubọchi Antipas onye-àmàm, onye nkem kwesiri ntukwasi-obi, onye eb͕uru n'etiti unu, ebe Setan bi.

14. Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n'ihi na i nwere n'ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n'iru umu Israel ihe-ima-n'ọnyà, ka ha rie ihe achuru n'àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.

15. Otú a, gi onwe-gi nwe-kwa-ra ufọdu ndi nējidesi ozizí ndi-Nikọlaitan ike otú ahu.

16. Ya mere, chègharia; ma asi na i meghi otú a anamabiakute gi ọsọsọ, M'gēwere kwa mma-agha nke ọnum bu agha megide ha.

Nkpughe 2