Nkpughe 14:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. ha we nābù dika agāsi na ọ bu abù ọhu n'iru oche-eze ahu, na n'iru ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru imuta abù ahu ma-ọbughi ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ ahu, bú ndi ab͕atarari n'uwa.

4. Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.

5. Ọ dighi kwa ugha ọ bula ahuru n'ọnu-ha: ha bu ndi anātaghi uta.

6. M'we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n'elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula;

7. ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.

8. Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya.

Nkpughe 14