Nehum 1:2-5 Bible Nso (IGBOB)

2. Chineke ekworo, Nke nābọ̀ kwa ọ́bọ̀, ka Jehova bu; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye-nwe ọnuma; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu n'aru ndi nēmegide Ya, onye nēdebere ndi-iro-Ya iwe ka Ọ bu.

3. Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ike, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmagh: Jehova, n'oké ikuku na n'oké ifufe ka uzọ-Ya di, igwe-oji bu kwa ájá ukwu-Ya abua.

4. Ọ nābasiri oké osimiri nba ike, me ka ọ ta, ọ bu kwa osimiri nile ka O meworo ka ha takọrọ: Beshan nātalata, ya na Kamel, ihe-opupú nke Lebanon nātalata kwa.

5. Ugwu nile emewo nkpatu site na Ya, ugwu ntà nile ab͕azewo kwa; ala we bulie onwe-ya site n'iru Ya, e, elu-uwa dum madu bi na ndi nile bi nime ya.

Nehum 1