Nehemaia 3:24-28 Bible Nso (IGBOB)

24. N'iso ya ka Binui nwa Henadad mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n'ulo Azaraia rue nkuku mb͕idi, ọbuná rue ulo-elu nkuku.

25. Palal nwa Uzai mere ka mb͕idi di ike site na ncherita-iru nkuku mb͕idi, na ulo-elu nke nāputa n'ulo di n'elu nke eze, bú nke di nso ogige ulo-nche. N'iso ya ka Pedaia nwa Parosh mere ka mb͕idi di ike.

26. (Ma Netinim nēbi n'Ofel, rue na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu, na ulo-elu nke nāputa aputa.)

27. N'iso ya ka ndi Tekoa mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita ulo-elu di uku nke nāputa aputa, we rue mb͕idi Ofel.

28. Site n'elu ọnu-uzọ-ama inyinya ka ndi-nchu-àjà mere ka mb͕idi di ike, nwoke ọ bula na ncherita-iru ulo-ya.

Nehemaia 3