Nehemaia 12:44-47 Bible Nso (IGBOB)

44. Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.

45. Ha we debe ihe-ndebe Chineke-ha, na ihe-ndebe ime-ka-adi-ọcha ahu, ha na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, dika ihe Devid na Solomon nwa-ya nyere n'iwu si di.

46. N'ihi na n'ubọchi Devid na Esaf site na mb͕e ochie onye-isi nke ndi-ọbù-abù di, na abù otuto na ikele-ekele nke anābùku Chineke.

47. Israel nile n'ubọchi Zerubabel, na n'ubọchi Nehemaia, nēnye kwa òkè nke ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya: ha nēdo-kwa-ra ndi Livai ihe nsọ; ndi Livai nēdo-kwa-ra umu Eron ihe nsọ.

Nehemaia 12