38. Usu nke-abua nke ndi nēkele ekele nke nēje izute ha je-kwa-ra, mu onwem so-kwa-ra ha je, mu na nkera ndi-ayi, n'elu mb͕idi, site n'akuku di n'elu n'ebe ulo-elu nke ite-ọku uku di, we rue mb͕idi sara mbara;
39. site kwa n'akuku di n'elu n'ebe ọnu-uzọ-ama Efraim di, na n'akuku ọnu-uzọ-ama ochie, na n'akuku ọnu-uzọ-ama azù, na ulo-elu Hananel, na ulo-elu Hamea, we rue ọnu-uzọ-ama aturu: ha we guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo-nche.
40. Usu abua ahu nke ndi nēkele ekele we guzo n'ulo Chineke, ha na mu onwem, nkera ndi nọchiri anya eze nọye-kwa-ram:
41. ndi-nchu-àjà, bú Elaiakim, na Maaseia, na Miniamin, na Maikaia, na Elioenai, na Zekaraia, na Hananaia, guzo-kwa-ra chiri opì;
42. na Maaseia, na Shemaia, na Eleeza, na Uzi, na Jehohanan, na Malkija, na Ilam, na Eza. Ndi-ọbù-abù na Jezrahia, bú onye-nlekọta-ha, we me ka anu olu-ha.