Ndi Rom 11:32-36 Bible Nso (IGBOB)

32. N'ihi na Chineke mechibidoro ha nile nime ekweyeghi-ekweye, ka O we mere ha nile ebere.

33. A! omimi nke àkù nke amam-ihe na nke ihe-ọmuma kwa nke Chineke! le otú anēnweghi ike ichọputa ikpé-Ya nile, otú anēnweghi kwa ike ituputa uzọ-Ya nile!

34. N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi? ma-ọbu ònye putara ibu onye Ya na ya nāb͕a izù?

35. ma-ọbu ònye buru uzọ nye Ya, agēnyeghachi kwa ya ọzọ?

36. N'ihi na ihe nile sitere nime Ya, site kwa n'aka-Ya, di-kwa-ra Ya. Ọ bu Ya ka otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

Ndi Rom 11