Ndi Rom 10:19-21 Bible Nso (IGBOB)

19. Ma asim, Ọ̀ gābu na Israel amaghi? Moses buru uzọ si,Mu onwem gēwere mba nābughi mba kpasue unu ekworo,Mba nēnweghi nghọta ka M'gēwere kpasue unu iwe.

20. Ma Aisaia nwere anya-ike nke-uku, we si,Ndi nāchọghm chọtaram;Ewerem gosi ndi nājughi ajuju n'akam.

21. Ma Ọ nēkwu okwu bayere Israel, si, Ogologo ubọchi dum ka M'b͕asara akam nye ndi nādighi-ekwenye, ndi nēkwugidekwam.

Ndi Rom 10