Ndi Rom 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Pọl, orù nke Jisus Kraist, onye akpọrọ ibu onye-ozi, onye ekewapuru nye ozi ọma Chineke,

2. nke O buru uzọ kwere na nkwa site n'ọnu ndi-amuma-Ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ,

3. bayere Okpara-Ya, Onye amuru site na nkpuru Devid dika anu-aru si di,

4. Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n'ike, dika Mọ nke idi-nsọ si di, site na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu; bú Jisus Kraist Onye-nwe-ayi,

5. Onye ayi sitere n'aka-Ya nata amara na ọlu onye-ozi, rue iṅa-nti nke okwukwe n'etiti mba nile, n'ihi aha-Ya:

6. ndi unu onwe-unu nọ kwa n'etiti ha, ndi akpọrọ ibu ndi nke Jisus Kraist:

Ndi Rom 1