3. N'aka-unu ka Chineke nyeworo ndi-isi Midian, bú Oreb na Zeeb: ma gini ka m'puru ime dika nke unu mere? Mb͕e ahu obi-ọku-ha juru n'aru ya, mb͕e o kwuru okwu ahu.
4. Gideon we biarue Jọdan igabiga, ya onwe-ya, na ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi soro ya, ha nāda #mbà, ma ha nāchu achu.
5. O we si ndikom Sukot, Biko, nyenu ndi nēsom n'ukwu n'ukwu ob͕e achicha; n'ihi na ha nāda #mbà, ma mu onwem nāchu Zeba na Zalmuna, bú ndi-eze Midian.
6. Ndi-isi Sukot we si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n'aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye usu-ndi-agha-gi nri?