20. N'elu-igwe ka ha si bū agha,Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.
21. Miri-iyi Kaishon bupuru ha,Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon.Nkpuru-obim, i nāzọda ike.
22. Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ikeSite n'iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike.
23. Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri,Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku;N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka,Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.
24. Agāgọzi Jael kari ndinyom,Bú nwunye Heba onye-Kenait,Kari ndinyom n'ulo-ikwū ka agāgọzi ya.
25. Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya;O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube.