26. Nwayi ahu we bia n'isi-ututu, da n'ọnu-uzọ ulo nwoke ahu ebe onye-nwe-ya nọ, rue mb͕e ìhè putara.
27. Onye-nwe-ya we bilie n'ututu, meghe ọnu-uzọ ulo ahu, we pua ije ije-ya: ma, le, nwayi ahu, bú iko-ya, adawo n'ọnu-uzọ ulo ahu, aka-ya abua di kwa na nbata-uzọ.
28. Ọ si ya, Bilie, ka ayi la; ma ọ dighi onye nāza: o we būru ya n'elu inyinya-ibu-ya; nwoke ahu we bilie, je rue ebe nke ya.
29. O we ba n'ulo-ya, were mma, jide iko-ya nwayi, bọ̀ ya, dika ọkpukpu-ya nile si di, n'ọbubọ̀ iri na abua, we zisa ya n'ókè-ala nile nke Israel.